Home
Links
Contact
About us
Impressum
Site Map?


Afrikaans
عربي
বাংলা
Dan (Mande)
Bahasa Indones.
Cebuano
Deutsch
English-1
English-2
Español
Français
Hausa/هَوُسَا
עברית
हिन्दी
Igbo
ქართული
Kirundi
Kiswahili
മലയാളം
O‘zbek
Peul
Português
Русский
Soomaaliga
தமிழ்
తెలుగు
Türkçe
Twi
Українська
اردو
Yorùbá
中文



Home (Old)
Content (Old)


Indonesian (Old)
English (Old)
German (Old)
Russian (Old)\\

Home -- Igbo -- 19-Good News for the Sick -- 016 (Our Response Today)
This page in: -- English -- French -- Hausa -- IGBO -- Indonesian -- Somali -- Yoruba

Previous Chapter -- Next Chapter

19. Ozi ọma maka ndị ọrịa
AKỤKỤ 2 - ORU EBUBE JIZỌS
2. ỌLU-EBUBE NILE NKE JIZOS, BÚ MESAIA: NLELE ANYA

F. Azịza anyị taa


Anyị kwenyere na Jizọs Mezaịa ahụ dị ka Okwu Chineke maka ụmụ mmadụ, nleta onwe onye nke Chineke si n'elu bịa n'ụwa anyị. Ma anyị kwenyere na ọrụ ebube nke Jizọs bụ ihe akaebe nke Chineke na Jizọs dịka ọnụnọ Ya na anyị n'ụwa a. Ya mere, anyị na-ekele Chineke maka Jizọs na maka ozi ọgwụgwọ Ya dị ebube.

Ọzọkwa, anyị na-ekele Chineke na site na Mmụọ Ya o mere ka ndị amụma na ndịozi kpalie ịkọrọ anyị Okwu ya n'Akwụkwọ Nsọ, nakwa na n'ime narị afọ ndị gafeworonụ O chekwakwara Okwu ya maka mmadụ nile. Edokwawo okwu ya n’ime Akwụkwọ Nsọ, n’ime ihe ị ga-ama dịka Tawrat, Zabur, Akwụkwọ Nsọ nke Ndị-amụma na Ozizi Nsọ nke Jizos Mesaịa ahụ. Toonụ Chineke, Akwụkwọ Nsọ ndị a bụ Okwu Chineke nke O chekwaworo anyị n’ime narị afọ ndị gafeworonụ dị ka Akwụkwọ Nsọ n’ezie, nke na-emebighị emebi na nke a na-emebibeghị!

N’ime Oziọma ahụ (“Ozi Ọma”) nke Jisọs, anyị nwere akụkọ ndekọta ndị ji anya ha hụ banyere Jisọs ndị ozi nke Mezaịa ahụ na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ banyere ọrụ ebube Jisọs. Site n’oge Jisus gawa, ha jere ozi dika ihe iriba-ama nke amara na ebere Chineke, ihe iriba-ama na-egosi, n’okwu ndịozi Jizọs n’ime Oziọma Nsọ, Chineke bụ ịhụnanya (1 Jọn 4:8) ma na-eche banyere mmadụ niile, ihe nile O kere.

Ọzọkwa, ọrụ ebube Jizọs bụụrụ gị ihe ịrịba ama taa. Ịkwesighi ịma jijiji, egwu, obi nkoropụ. Ọ na-akpọ gị òkù ka ị chigharịkwuuru Ya site n’ekpere nke ekele gị na site n’arịrịọ gị maka enyemaka Ya n’oge awa nke ọrịa na ahụhụ gị ma ọ bụ mkpa ọ bụla ọzọ. Jizọs dị ndụ!

N'otu aka ahụ Ọ na-akpọkwa gị òkù ịtụgharị uche n'okwu Devid, onye amụma ukwu na eze ya, na ikwupụta mmehie gị: “Ngọzi na-adịrị onye a gbaghaara mmebi iwu ya, onye ekpuchirikwara mmehie ya. Ngọzi nādiri nwoke ahu nke Jehova nāgughi nmehie-ya megide ya, onye-aghughọ nādighi kwa nime mọ-ya.” (Abụ Ọma 32:1, 2)

Dị ka Okwu Chineke, ọ bụghị nanị na ọ na-eduzi anyị kamakwa ọ na-agwọ anyị, na-agbapụta ma na-eme ka anyị dị ọcha.

N’isiakwụkwọ ndị na-esonụ, anyị ga-elebakwu anya n’oké ihe ịrịba ama ndị a nke Jizọs.

www.Grace-and-Truth.net

Page last modified on August 15, 2024, at 03:18 PM | powered by PmWiki (pmwiki-2.3.3)