Previous Chapter -- Next Chapter
Okwuchukwu Pụrụ Iche
N'amaokwu nke 46 nke Sura al-Ma'ida, e nwere okwu dị ịtụnanya - na Oziọma ahụ gụnyere okwuchukwu pụrụ iche maka ndị na-atụ egwu Chineke. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-abụghị Ndị Kraịst amaghị ozizi a. Muhammad nwere mmasị ịmata ịdọ aka ná ntị pụrụ iche na agbamume dị nsọ, ma o nweghị ike ịgụ Oziọma ahụ n'ihi na a sụgharịbeghị ya n'asụsụ Arabik n'oge ya. Otú ọ dị, ọ jụrụ ajụjụ banyere akụkụ ụfọdụ nke okwuchukwu a nke na-agbalị ịchọpụta banyere ido ndị na-eso ụzọ Kraịst nsọ. Taa, onye ọ bụla nwere ike ịgụ okwuchukwu a pụrụ iche, nke a kpọtụrụ aha na Kor'an, n'ihi na ejiri nlezianya sụgharịa ozi ọma ahụ na Arabik. Aha ozi a pụrụ iche bụ “Ozizi Elu Ugwu ahụ” (Matiu 5:1-7:29). Anyị na-ahụ n'ime ya iwu nke alaeze ime mmụọ nke Allah. Ngwugwu okwuchukwu a bu oku nke Kraist, “Unu gzu oke, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru oke” (Matteu 5:48). Anyị dị njikere iziga gị na onye ọ bụla chọrọ ịgụ na banye n'ime mkpughe nke a dị nsọ. Ọ bụrụ na i debe okwu ya, ị ga-enweta ike eluigwe maka mkpụrụ obi gị akpịrị kpọrọ nkụ.