Previous Chapter -- Next Chapter
1. Kraịst - Onye E Tere Mmanụ
Aha nke abụọ nke Ọkpara Meri na ọkwa Jibril bụ Kraịst, Onye e tere mmanụ nke mmụọ nke Allah na ike ya. N’ime Testament Ochie, ndị eze, ndị nchụ-aja na ndị-amụma ka e ji mmanụ nke annụrị tee ha dịka ihe ịrịba ama mpụga na ha natara ike nke Mụọ Nsọ maka ọkwa-ọrụ ha. Aha ahụ Kraịst pụtara n’ụzọ nkịtị: onye ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, dịka Ọkpara Meri gbara ama banyere onwe ya na Nazaret:
“Mmụọ nke JEHOVA dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tewo m mmanụ ikwusara ndị ogbenye ozi ọma, o zitewokwa m ka m gwọọ ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa nnwere onwe nye ndị a dọọrọ n’agha, na ime ka ndị ìsì hụ ụzọ, na ime ka ha nwere onwe ha ndị a na-emegbu emegbu, ịkpọsa afọ JEHOVA na-anara nke ọma.” (Luk 4:18-19)
Kraịst ji Mụọ Nsọ Ya metụ aka, ndị matara ma kwupụta mmehie ha na ire ure, ma kwere na ngbanwe nke aja mgbaghara mmehie ya maka ha. Ọ na-enye ndị mmehie chegharịrị ihe ùgwù ịrịọ Ya maka mmanụ ime mmụọ a, n’ihi na Kraịst bịara ime ka ndị mmehie furu efu dị ọhụrụ. O nwere ike ido ha nsọ ma ha tụkwasị ya obi. Mgbe ahụ, Ọ na-enyefe ndụ nke ya n'ime ha ma jiri ike dị nsọ kwado ha maka ije ozi dị irè.