Grace and TruthThis website is under construction ! |
|
Home Afrikaans |
Home -- Igbo -- 20-For Readers of the Qur'an -- 006 (The Light of the World)
Previous Chapter -- Next Chapter 20. Maka ndị na-agụ Akwụkwọ nke Kor'an'
AKWỤKWỌ 1 - NDABERE OZI OMA NKE KRAIST
Ìhè nke ỤwaKor'an na-agba ama na ìhè nke Allah na-enwu nke ọma n'Oziọma na na onye ọ bụla na-agụ okwu nke Kraịst ga-amụba ìhè ka ìhè eluigwe wee nwuo site na ya. Ọ gaghị eje ije n'ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ọdịnihu dị mma. Kraịst siri, “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa, onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ” (Jọn 8:12). Kraịst na-enye ndị na-eso ụzọ ya ìhè ka ha ghara ije ije na ndụ na-agbagwoju anya, kama ha buru ìhè nke eluigwe n'ime obi ha. Kraist kwuru, “Ka ìhè-unu nwue n'iru madu, ka ha we hu ezi ọlu-unu, we nye Nna-unu nke elu-igwe otuto” (Matteu 5:16). Ha ga-ahapụ aghụghọ, ịkwa iko na ịkpọasị ma na-ejere ndị ọzọ ozi ka ìhè eluigwe wee birikwa n’ime ha. |