Grace and Truth

This website is under construction !

Search in "Igbo":
Home -- Igbo -- 14-Christ and Muhammad -- 016 (Muhammad and Christ After Their Deaths)
This page in: -- Cebuano -- English -- German? -- Hausa -- IGBO -- Indonesian -- Somali -- Telugu -- Ukrainian -- Yoruba

Previous Chapter -- Next Chapter

14. KRAIST na MUHAMMAD
Nchọpụta Dị Na Koran Banyere Kraist Na Muhammad

8. Muhammad na Kraist Mgbe Ha Nwuchara


E liri Muhammad na Madina, ili ya ka dịkwa ruo taa. Ndị Alakụba kwenyere na mkpụrụ obi ya nọ n'etiti ndị nwụrụ anwụ (Barzakh), na-eche ụbọchị ikpe.

Anyi na-aguta na kor'an na Chineke mere ka Kraist biakute Onwe Ya, kwere ya nkwa:

"Osaị, M ga-eme ka ị nwụọ, ma ga-ewelite gị nye m." (Sura Al Imran 3:55)

إِنِّي مُتَوَفِّيك وَرَافِعُك إِلَي (سُورَة آل عِمْرَان ٣ : ٥٥)

Ekwere nkwa a na kor'an dika eziokwu nke mezuru:

"Ma Allah kpọlitere ya n'ebe Onwe Ya." (Sura al-Nisa '4: 158)

بَل رَفَعَه اللَّه إِلَيْه (سُورَة النِّسَاء ٤ : ١٥٨)

N’uzo ozo, Chineke kporo Okpara Meri si n’ili we me ka O bilie n’elu onwe Ya. O bizi Chineke nso, na-asọpụrụ ya nke ukwuu n'ụwa na mgbe ebighi ebi. Koran na-agba akaebe:

“O Meriam, Allah na-enye gị ozi ọma nke Okwu sitere n’aka Ya onye aha ya bụ Mezaịa, Isa, Nwa Meri; asọpụrụ nke ukwuu n'ụwa na nke a, na-eru nso Allah." (Sura Al Imran 3:45)

يَا مَرْيَم إِن اللَّه يُبَشِّرُك بِكَلِمَة مِنْه اسْمُه الْمَسِيح عِيسَى ابْن مَرْيَم وَجِيها فِي الدُّنْيَا وَالآخِرَة وَمِن الْمُقَرَّبِين (سُورَة آل عِمْرَان ٣ : ٤٥)

Ili Kraist tọgbọ chakoo, n’ihi na Ọ biliwo, dịka O kwusara tupu oge eruo. Ma foduru nke Muhammad ka nọ n'ili ya. Kraist di ndu. Muhammad anwụọla. Muhammad esiteghi n’ili bilie ma ọlị n’eluigwe. Onwere nnuku odidi di nkpa n’etiti ndu na onwu. Dika ndu kariri onwu, ya mere Kraist kariri Muhammad. Jizọs bụ ndụ ebighi ebi n'ime mmadụ. Kor'an n'onwe ya na-egosi Kraist di ndu maka ndi nile na acho ndu ebighi ebi.

www.Grace-and-Truth.net

Page last modified on November 07, 2023, at 05:31 AM | powered by PmWiki (pmwiki-2.3.3)