Previous Chapter -- Next Chapter
1) 'Isa (عيسى)
Aha a pụtara ugboro iri abụọ na ise na Koran. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na o si n’otú Siria si akpọ okwu Aramaic maka Jizọs, nke pụtara ná mmalite: “JEHOVA na-azọpụta” (Matteu 1:21); Ọ na-anapụta n'aka ọdachi, ọrịa, nhụjuanya, ọnụma na-abịanụ, mmehie na ọbụna ọnwụ.
N'ime ndụ ya, Isa mezuru ihe aha mbụ ya pụtara. O meghere anya ndị ìsì n’ejighị ịwa ahụ́, gwọọ ndị ekpenta site n’okwu ya dị ike, mee ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ site n’ịkpọ òkù ya, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ndị nwere mmụọ. Onye ghọtara aha mbụ ya, bụ́ Jizọs, pụrụ ịnata ike ebighị ebi site na ya.
Ntụtụ aka nke Kor’an na Isa: Suras al-Baqara 2:87, 136, 253; -- Al 'Imran 3:45, 52, 55, 59, 84; -- al-Nisa' 4:157, 163, 171; -- al-Ma'ida 5:46, 78, 110-116; -- al-An'am 6:85; -- Maryam 19:34; -- al-Ahzab 33:7; -- al-Shura 42:14; -- al-Zukhruf 43:63; -- al-Hadid 57:27; -- al-Saff 61:6, 14.