Previous Chapter -- Next Chapter
Mmadụ Ọ̀ Ga-anọgide n'Ajọ omume?
Ọtụtụ ndị ka nọ n’ajọ omume. Onye ọ bula nke neme ihe ọjọ bu onye-nmehie, ọ gaghi-eketa kwa ala-eze Chineke.
“Ihe ọjọ ga-egbu ndị ajọ omume, ma ndị na-akpọ onye ezi omume asị ga-abụ ebe tọgbọrọ n’efu” (Abụ Ọma 34:21).
“JEHOVA, bú Chineke-unu, bu Chineke ekworo, newere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ntakiri rue ọb͕ọ nke-atọ na nke anọ” (Ọpupu 20:5).
“Ka onye nemebi iwu rapu uzọ-ya, ka onye ajọ omume rapu kwa èchìchè-ya nile: ka ọ laghachikute kwa JEHOVA, nyekwa Chineke-ayi, n’ihi na Ọ gab͕aghara nke-uku” (Aisaia 55:7).
Ọ bụrụ na Chineke agbaghara, ọ naghị echeta ọzọ. Jizọs Kraịst anwụọla n’ihi mmehie anyị. Ọ sachara mmehie anyị niile wee nye nnwere onwe, mgbapụta site n’ọbara Ọ wụfuru n’elu obe.
“Lee Nwa-atụrụ Chineke,
onye na-ewepụ mmehie nke ụwa”
(Jọn 1:29).
Ọbụna tupu ụbọchị ahụ anyị kwekọrịtara na m ga-anwụ, anọ m n’obi Onyenwe m na Onye Nzọpụta m bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 10:3) Jizọs gbapụtara m ma sachapụ m mmehie niile.