Previous Chapter -- Next Chapter
34. Kpachara anya ka ị na-eduhie onye ọ bụla
“5 Onye ọ bụla nke na-anabata otu nwatakịrị dị otú ahụ n’aha m na-anabata m; 6 ma onye ọ bula nke nēme otù nime ndi-ntà ndia ndi kwere na Mu ka ha sụọ ngọngọ, ọ di nma ka akwuba nkume-igwe-nri di arọ́ n'olu-ya, ka miri we mikpuru n'ob͕u-miri nke oké osimiri. 7 Ahụhụ ga-adịrị ụwa n’ihi ọnwụnwa ya nke ime mmehie! N’ihi na ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere na ọnwụnwa ga-abịa; ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye ọnwunwa ahu nēsi n'aka-ya bia! 8 Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi emewo ka i su ngọngọ, b͕upu ya, tufue ya; ọ di gi nma ibà na ndu di ngwurọ ma-ọbu ngwọrọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua, ka ewe tubà gi n'ọku ebighi-ebi. 9 Ma ọ bụrụ na anya gị eme ka ị sụọ ngọngọ, wepụ ya, tụfuo ya. Ọ kaara gị mma iji otu anya bata na ndụ karịa inwe anya abụọ, tụba gị n'ọkụ ala mmụọ. (Matteu 18:5-9)