Previous Chapter -- Next Chapter
e) Onye na-ekpughe ihe nzuzo
Na kor'an, Muhammad kwupụtara:
"Anaghị m agwa gị na m nwere akụ nke Allah. Amaghịkwa m ihe a na-adịghị ahụ anya.” (Sura al-An'am 6:50)
لا أَقُول لَكُم عِنْدِي خَزَائِن اللَّه وَلا أَعْلَم الْغَيْب (سُورَة الأَنْعَام ٦ : ٥٠)
Ma na Kraịst, ikpe dị iche. Muhammad rụtụrụ aka n’ebe Jizọs Kraịst nọ wee sị na Ya onwe ya bụ onye maara ihe nzuzo mmadụ ma hụkwa ihe a na-adịghị ahụ anya; ikike ndị a bụụrụ nanị Chineke. Muhammad ruturu aka na Kraist na Koran:
"M ga-agwa gị ihe ị na-eri, na ihe ị na-echekwa n’ụlọ gị. N'ezie na nke ahụ bụ ihe ịrịba ama maka gị, ma ọ bụrụ na ị bụ ndị kwere ekwe." (Sura Al Imran 3:49)
وَأُنَبِّئُكُم بِمَا تَأْكُلُون وَمَا تَدَّخِرُون فِي بُيُوتِكُم إِن فِي ذَلِك لآيَة لَكُم إِن كُنْتُم مُؤْمِنِين (سُورَة آل عِمْرَان ٣ : ٤٩)
Muhammad kọwara ikike Kraịst dị ka ịmara ihe niile, iji katọọ ma dọọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya otuto. Ufọdụ ndị otu Alakụba ya si Madina kpọrọ ya asị, n’ihi na ha zoro nri na akụ ha n’ụlọ ha, na-ajụ iso ndị si mba Macca kwabata ịba ọghọm ha niile. N’ihi ya, ọ dọrọ ha aka ná ntị na Kraịst ga-abịa n’oge na-adịghị anya dịka Onyeikpe, ikpe ụbọchị ikpe. Muhammad kwupụtara na Kraist ga-ama ihe niile ha mere na nzuzo n'ụlọ ha. Ọ ga-amata ọ bụghị naanị ihe ha riri, kamakwa ihe ha zoo. Agaghị enwe ike ịgbanahụ Ya n’anya n’ụbọchị ikpe. O nweghi otutu ihe akaebe ma obu nnabata kachasi nma nke Muhammad banyere chi nke Kraist kari nke a. O kwuputara na Kraist maara eziokwu zoro ezo ma nwekwaa ike iguzo ihe nzuzo di n’obi mmadu. Ọ maara ihe nzuzo gị niile. Ọ ga-ekpughere gị ọrụ gị ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ, n’ihi na Ọ bụ Onye maara ihe niile. Ọ dịghị onye nwere ike zoo ihe ọ bụla si Ya.