Grace and TruthThis website is under construction ! |
|
Home Afrikaans |
Home -- Igbo -- 18-Bible and Qur'an Series -- 039 (MOSES AND THE PROPHET)
This page in: -- English -- Hausa -- IGBO -- Indonesian -- Somali -- Yoruba
Previous Chapter -- Next Chapter 18. Kor’an na usoro Baịbụl
AKWỤKWỌ 5 - A buru MUHAMMAD N'AMỤMA na Baịbụl?
(Azịza nye Akwụkwọ nta Ahmed Deedat: Ihe Baịbụl na-ekwu gbasara Muhammad)
B - MOZIS NA AMỤMA“M'geme kwa ka onye-amuma di ka gi biliere ha n'etiti umu-nne-ha; m'gatiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gagwa kwa ha ihe nile nke Mu onwem nenye ya n'iwu.” (Deuterọnọmi 18:18) Mgbe ọ bụla ndị Alakụba na-achọ ikwado na e buru amụma Muhammad na Torah, Agba Ochie, ha na-ezo aka n'amaokwu a mgbe niile dịka otu amụma doro anya na-akwado nzọrọ ha. Ha na-arụ ụka na onye amụma ahụ Chineke kwere Mozis ná nkwa bụ Muhammad n'ihi na:
Anyị ga-atụle nzọrọ ndị a ná nkenke, anyị ga-emekwa ya n’ụzọ kwekọrọ n’okwu amụma ahụ, n’ihi na nke a bụ nanị ụzọ a pụrụ isi nweta nkọwa ziri ezi nke ihe odide ahụ. Onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi na-akọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ maara na ọ dịghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a pụrụ ịkọwa nke ọma ma ọ bụrụ na e kewapụrụ ya na ihe ndị gbara ya gburugburu. Ya mere, ọ dị mkpa ka a na-ehota ihe site n'akụkụ nile nke a na-ahụ amụma ahụ na ihe odide abụọ ndị a dị oke mkpa: Ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị niile, agaghị enwe òkè ma ọ bụ ihe nketa n’etiti Izrel; ha geri àjà-ọku anachuru JEHOVA, na òkè-ya. Ọ dighi ihe-nketa ha genwe n'etiti umu-nne-ha; JEHOVA bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu. (Deuterọnọmi 18:1-2)
JEHOVA, bú Chineke-unu, geme kwa ka onye-amuma di kam si n'etiti unu biliere unu, n'etiti umu-nne-unu, ya ka unu gahu kwa, dika unu riọrọ n'aka JEHOVA, bú Chineke-unu, nime Horeb, n'ubọchi nkpọkọta ahu, mb͕e unu siri, ‘m'gaghi-anu kwa olu JEHOVA, bú Chinekem, ọzọ, hu kwa ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu.’ JEHOVA wee sị m: ‘Ha ekwuwo n’eziokwu, ihe niile ha kwuru. M'geme kwa ka onye-amuma di ka gi biliere ha n'etiti umu-nne-ha; + m ga-etinyekwa okwu m n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu. Ma onye ọ bula nke nadighi-aṅa nti okwum nile nke ọ gekwu n'aham, mu onwem gajuta ya n'aka-ya. Ma onye amụma nke na-ebuli onwe ya elu ikwu okwu n’aha m nke m na-enyeghị ya n’iwu ka o kwuo, ma ọ bụ onye na-ekwu n’aha chi ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụ. (Deuterọnọmi 18:15-20)
Anyị ga-aga n'ihu ịtụle isi ihe atọ ndị a na-ekwu na-egosi na Muhammad bụ onye amụma e zoro aka na ya n'edemede ma emesia anyị ga-achọpụta kpọmkwem onye amụma e zoro aka na ya n'amụma dị na Deuterọnọmi 18:18. |