Grace and Truth

This website is under construction !

Search in "Igbo":
Home -- Igbo -- 18-Bible and Qur'an Series -- 039 (MOSES AND THE PROPHET)
This page in: -- English -- Hausa -- IGBO -- Indonesian -- Somali -- Yoruba

Previous Chapter -- Next Chapter

18. Kor’an na usoro Baịbụl
AKWỤKWỌ 5 - A buru MUHAMMAD N'AMỤMA na Baịbụl?
(Azịza nye Akwụkwọ nta Ahmed Deedat: Ihe Baịbụl na-ekwu gbasara Muhammad)

B - MOZIS NA AMỤMA


“M'geme kwa ka onye-amuma di ka gi biliere ha n'etiti umu-nne-ha; m'gatiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gagwa kwa ha ihe nile nke Mu onwem nenye ya n'iwu.” (Deuterọnọmi 18:18)

Mgbe ọ bụla ndị Alakụba na-achọ ikwado na e buru amụma Muhammad na Torah, Agba Ochie, ha na-ezo aka n'amaokwu a mgbe niile dịka otu amụma doro anya na-akwado nzọrọ ha. Ha na-arụ ụka na onye amụma ahụ Chineke kwere Mozis ná nkwa bụ Muhammad n'ihi na:

  1. A na-ekwu na Kor'an bụ Okwu Chineke, ya mere, dịka Muhammad na-agụgharị akụkụ ọ bụla e nyere ya, o mere ka etinye okwu nke Chineke n'ọnụ ya dịka okwu nke amụma a siri dị;
  2. Onye-amụma nke na-abịa ga-esi n’etiti ụmụnne nke ụmụ Israel, ya mere ndị Ishmael, n’ihi na Israel (Jekọb) na Ishmael sitere na Abraham, ya mere ebo nile sitere n’ụmụ ndị ikom iri na abụọ nke Ishmel bụ “ụmụnne” nke ebo nile ndi sitere na umu-ndikom iri na abua nke Israel. Dika Muhammad bu nani onye Ishmael nke kwuputara ibu amuma n'usoro nke ndi amuma Agba ochie, ha na-eche na amuma ahu nwere ike izo aka na ya;
  3. Muhammad dị ka Mozis n'ọtụtụ ụzọ nke na amụma ahụ nwere ike na-ezo aka na ya.

Anyị ga-atụle nzọrọ ndị a ná nkenke, anyị ga-emekwa ya n’ụzọ kwekọrọ n’okwu amụma ahụ, n’ihi na nke a bụ nanị ụzọ a pụrụ isi nweta nkọwa ziri ezi nke ihe odide ahụ. Onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi na-akọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ maara na ọ dịghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a pụrụ ịkọwa nke ọma ma ọ bụrụ na e kewapụrụ ya na ihe ndị gbara ya gburugburu. Ya mere, ọ dị mkpa ka a na-ehota ihe site n'akụkụ nile nke a na-ahụ amụma ahụ na ihe odide abụọ ndị a dị oke mkpa:

Ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị niile, agaghị enwe òkè ma ọ bụ ihe nketa n’etiti Izrel; ha geri àjà-ọku anachuru JEHOVA, na òkè-ya. Ọ dighi ihe-nketa ha genwe n'etiti umu-nne-ha; JEHOVA bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu. (Deuterọnọmi 18:1-2)
JEHOVA, bú Chineke-unu, geme kwa ka onye-amuma di kam si n'etiti unu biliere unu, n'etiti umu-nne-unu, ya ka unu gahu kwa, dika unu riọrọ n'aka JEHOVA, bú Chineke-unu, nime Horeb, n'ubọchi nkpọkọta ahu, mb͕e unu siri, ‘m'gaghi-anu kwa olu JEHOVA, bú Chinekem, ọzọ, hu kwa ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu.’ JEHOVA wee sị m: ‘Ha ekwuwo n’eziokwu, ihe niile ha kwuru. M'geme kwa ka onye-amuma di ka gi biliere ha n'etiti umu-nne-ha; + m ga-etinyekwa okwu m n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu. Ma onye ọ bula nke nadighi-aṅa nti okwum nile nke ọ gekwu n'aham, mu onwem gajuta ya n'aka-ya. Ma onye amụma nke na-ebuli onwe ya elu ikwu okwu n’aha m nke m na-enyeghị ya n’iwu ka o kwuo, ma ọ bụ onye na-ekwu n’aha chi ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụ. (Deuterọnọmi 18:15-20)

Anyị ga-aga n'ihu ịtụle isi ihe atọ ndị a na-ekwu na-egosi na Muhammad bụ onye amụma e zoro aka na ya n'edemede ma emesia anyị ga-achọpụta kpọmkwem onye amụma e zoro aka na ya n'amụma dị na Deuterọnọmi 18:18.

www.Grace-and-Truth.net

Page last modified on July 07, 2024, at 02:29 AM | powered by PmWiki (pmwiki-2.3.3)