Grace and Truth

This website is under construction !

Search in "Igbo":
Home -- Igbo -- 20-For Readers of the Qur'an -- 086 (Who is The Greatest?)
This page in: -- Arabic? -- English -- French? -- Hausa -- IGBO -- Indonesian -- Somali -- Yoruba

Previous Chapter -- Next Chapter

20. Maka ndị na-agụ Akwụkwọ nke Kor'an'
AKWỤKWỌ 6 - Ị MAARA AMAMIHE NKE KRAỊST?

27. Onye Kasị Ukwuu?


1 Ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere Jizọs, sị: ‘Ònye bụkwa onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe?’ 2 O wee kpọọ otu nwatakịrị nwoke ka ọ kpọta ya n’ihu ha, 3 wee sị: ‘N’ezie, a sị m unu, ma ọbụghị na unu agbanweela wee dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe. 4 Ya mere, onye ọ bula nke nēweda onwe-ya dika nwatakiri a, ọ bu onye uku n'ala-eze elu-igwe. 5 Ma onye ọ bụla nke na-anabata otu nwatakịrị dị otú ahụ n’aha m na-anabata m.’” (Matteu 18: 1-5)

25 Ma Jizos kpọrọ ha biakute Onwe-ya, si, Unu onwe-unu matara na ndi-isi nke ndi mba ọzọ na-eme ha ka ha nwe ha, ndi uku ha nēnwe kwa ike n'ebe ha nọ. 26 Ọ bughi otú a n'etiti unu, kama onye ọ bula nke nāchọ ibu onye uku n'etiti unu gābu orù-unu, 27 ma onye ọ bula nke nāchọ ibu onye-isi n'etiti unu gābu orù-unu; 28 N’ihi na Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, na ka o nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Matteu 20:25-28)

13 Mgbe ahụ a kpọtaara ya ụfọdụ ụmụntakịrị ka o wee bikwasị ha aka n’isi kpee ekpere; ndi nēso uzọ-Ya we bara ha mba. 14 Ma Jizos siri, Rapunu umu-ntakiri, unu egbochi-kwa-la ha ibiakutem; n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otú a.’ 15 Mgbe o bikwasịrị ha aka n’isi, o si n’ebe ahụ pụọ.” (Matteu 19:13-15)

www.Grace-and-Truth.net

Page last modified on September 10, 2024, at 08:38 AM | powered by PmWiki (pmwiki-2.3.3)